Genesis 21

Ọmụmụ Aịzik

1 Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa. 2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa. 3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik. 4Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu. 5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.

6Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.” 7O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”

Ebraham achụpụ Hega na nwa ya

8Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara.
Nʼusoro omenaala, ọ bụ mgbe nwantakịrị gbara afọ abụọ, maọbụ atọ ka a na-akwụsị ya ara. Nʼoge ochie, ị kwụsị nwantakịrị ara na-abụ oge mmemme na oke oriri.
Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.
9Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo, 10ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.”

11Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi. 12Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha. 13Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.”

14Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.

15Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa. 16Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.

17Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla
Chineke anụla Maọbụ, Chineke na-anụ, bụ ihe Ishmel pụtara.
olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina.
18Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.”

19Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.

20Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma. 21Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.

Nkwekọrịta e nwere na Bịasheba

22Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme. 23Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.”

24Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”

25Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi. 26Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”

27Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta. 28Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche, 29Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”

30Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”

31Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.

32Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia. 33Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha Onyenwe anyị, Chineke ebighị ebi. 34Ebraham bigidere nʼala ndị Filistia ogologo oge.

Copyright information for IboBIU